Isaiah 12

Abụ Otuto

1Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwu sị,

“Aga m eto gị Onyenwe anyị.
Ọ bụ ezie na ị wesara m iwe,
ma ugbu a, iwe gị adajụọla;
ị kasịkwara m obi.
2Nʼezie, Chineke bụ onye nzọpụta m;
aga m atụkwasị ya obi, ụjọ agaghị atụkwa m.
Onyenwe anyị, Onyenwe anyị ya onwe ya, bụ ike m bụrụkwa abụ m,
ọ ghọrọla m onye nzọpụta.”
3Ị ga-eji ọṅụ dọrọ mmiri
site nʼolulu mmiri nke nzọpụta.
4Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwukwa sị,

“Nyenụ Onyenwe anyị otuto, Kwupụtakwa aha ya ;
meenụ ka amata nʼetiti mba niile ihe niile ọ rụrụ ;
kwusaanụ na aha ya bu ihe e buliri elu.
5Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, nʼihi na o meela oke ihe dị ebube.
Meekwanụ ka ụwa niile mara ihe ọ rụrụ.
6Ka ndị niile bi na Zayọn tie mkpu ọṅụ, bụkwaa abụ.
Nʼihi na Onye nsọ nke Izrel. d dị ukwuu, e, ọ dị ike nke ukwuu, bụ Onye ahụ na-ebi nʼetiti unu.” e
Copyright information for IboBIU