Psalms 114
Abụ ncheta ngabiga
1Mgbe ụmụ Izrel si nʼala Ijipt pụta,mgbe ezinaụlọ Jekọb sitekwara nʼebe ndị asụsụ ha dị iche pụta,
2Juda ghọrọ ebe nsọ Chineke,
Izrel ghọrọ ala ọ na-achị.
3Osimiri hụrụ ya, gbaa ọsọ, a
osimiri Jọdan hụkwara ya chigharịa laa azụ b;
4Ugwu ukwu niile wụliri elu dịka ebule;
ugwu nta niile wụlikwara elu dịka ụmụ atụrụ.
5Gịnị mere gị oke osimiri, i ji na-agba ọsọ?
Osimiri Jọdan, gịnị na-eme gị i ji chigharịa laa azụ?
6Gịnị na-eme unu, ugwu ukwu niile unu ji na-awụli elu dịka ụmụ ebule?
Gịnị na-emekwa unu, ugwu nta niile, unu ji na-awụli elu dịka ụmụ atụrụ?
7Ka ụwa niile maa jijiji nʼihu Onyenwe anyị,
ka ọ maakwa jijiji nʼihu Chineke nke Jekọb,
8onye mere ka oke nkume ghọọ ọdọ mmiri,
onye mere ka ọmụ nkume ghọọ isi iyi mmiri. ▼
Copyright information for
IboBIU