Psalms 23
Abụ Ọma Devid.
Onyenwe anyị na-azụ anyị dị ka atụrụ
1 Onyenwe anyị na-azụ m dịka atụrụ, ọ dịghị ihe akọrọ m.2Ọ na-eme ka m dinaa ala nʼebe ahịhịa ndụ na-eto,
ọ na-edugharị m nʼakụkụ mmiri dị jụụ,
3ọ na-atụte mkpụrụobi m.
Ọ na-edu m nʼụzọ niile nke ezi omume
nʼihi aha ya.
4A sịkwarị na m na-aga ije,
na ndagwurugwu nke ọchịchịrị ọnwụ,
agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla;
nʼihi na ị nọnyeere m,
mkpọrọ gị na mkpanaka gị
na-akasị m obi.
5Ị na-akwado tebul ▼
▼Nʼoge ochie, ọ bụ nʼebe iri nri (tebul) ka enyi na enyi na-anọ agba ndụ, maọbụ nwe nkwekọrịta. Oriri a na-egosi na ọgbụgba ndụ bụ ihe ọṅụ na ezi mmekọrịta nke enyi na enyi. Eze ahụ nke na-azụ ndị ya dịka atụrụ, nabatara ohu ya bụ Devid nʼebe iri nri, dịka e dere ya nʼabụ ọma a.
nʼihu m,nʼanya ndị iro m.
I tere isi m mmanụ ▼
iko m na-ejubiga oke.
6Nʼezie, ịdị mma na ebere ga-agbaso m
ogologo ụbọchị niile nke ndụ m,
m ga-ebikwa nʼụlọ Onyenwe anyị
mgbe niile ebighị ebi.
Copyright information for
IboBIU