Psalms 47
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ụmụ Kora. Abụ Ọma.
Chineke bụ eze nke ụwa
1Kụọnụ aka unu, unu mba niile;jiri iti mkpu ọṅụ tikuo Chineke.
2Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke kachasị ihe niile elu.
Ọ dị egwu! Ọ bụ eze ukwu na-achị ụwa niile.
3O wedara mba niile mee ka ha nọọ nʼokpuru anyị;
ndị mmadụ niile nọ nʼokpuru ụkwụ anyị.
4Ọ họpụtaara anyị ihe nketa anyị,
ihe ịnya isi nke Jekọb, onye ọ hụrụ nʼanya. Sela
5Chineke ewerela iti mkpu ọṅụ rigoro nʼeluigwe.
Onyenwe anyị ewerela olu opi ike rigoo.
6Bụkuonụ Chineke abụ otuto, bụọ abụ otuto;
bụkuonụ eze anyị abụ otuto, bụọ abụ otuto. ▼
▼Ngwa egwu eji mpi anụmanụ mee, a na-akpọ Shọfa, ka eji abụ abụ. Ọ bụkwa ya ka a eji akpọsa afọ ọhụrụ nye ndị mmadụ.
7Nʼihi na Chineke anyị bụ eze ụwa niile.
Jirinụ abụ too ya.
8Chineke bụ eze mba niile;
ọ na-anọkwasị nʼocheeze ya dị nsọ na-achị mba niile.
9Ndị niile a ma ama na mba niile ezukọtaala,
dịka ndị Chineke nke Ebraham,
nʼihi na ndị eze ▼
▼Maọbụ, ọta
niile dị nʼụwa bụ nke Chineke;ọ bụ onye e buliri elu nʼebe ọ dị ukwuu.
Copyright information for
IboBIU