Psalms 75
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke olu abụ “E bibikwala.” Abụ Ọma Asaf. Otu Abụ.
Ikpe ikpe ziri ezi nke Chineke
1Anyị na-eto gị, O Chineke.Anyị na-eto gị, nʼihi na aha gị dị nso.
Ndị mmadụ na-ekwu banyere ọrụ ebube gị dị iche iche.
2Ị na-asị, “Ana m ahọpụta oge a kara aka.
Ọ bụ m na-ekpe ikpe ziri ezi.
3Mgbe ụwa na mmadụ niile bi nʼime ya na-ama jijiji,
ọ bụ m na-ejidesi ogidi ▼
▼Ya bụ, ntọala
ya ike ka o guzo chịm. Sela4Nye ndị mpako, ana m asị, ‘Unu etukwala ọnụ ọzọ,
nye ndị ajọ omume, ana m asị, Unu ewelila mpi ▼
▼Mpi na-anọchite anya ike nʼebe a
unu elu.5Unu ewelila mpi unu megide eluigwe;
unu ejila nnupu isi kwuo okwu.’ ”
6Ọ dịghị onye ọbụla sitere nʼọwụwa anyanwụ, maọbụ nʼọdịda anyanwụ,
maọbụ nʼọzara nke pụrụ ibuli mmadụ elu.
7Kama ọ bụ Chineke, onye na-ekpe ikpe;
ọ na-eweli otu onye elu, wedakwa onye ọzọ ala.
8Otu iko dị nʼaka Onyenwe anyị
nke jupụtara na mmanya na-agba ụfụfụ nke a gwanyekọtara ụda dị iche iche.
Ọ na-awụpụ ya, ndị ajọ omume niile nke ụwa
na-aṅụ ya ruo mgbe ọ gwụsịrị.
9Ma mụ onwe m, aga m ekwupụta nke a ruo mgbe ebighị ebi.
Aga m abụku Chineke nke Jekọb abụ otuto,
10bụ onye sịrị, “Aga m ebipụ mpi ndị ajọ omume niile,
ma a ga-ebuli mpi ndị ezi omume elu.”
Copyright information for
IboBIU