1 Chronicles 6:66-70


66E sitere nʼala ndị ebo Ifrem kenye ụfọdụ nʼime ndị agbụrụ Kohat obodo ụfọdụ.
67Nʼala ugwu ugwu Ifrem e kenyere ha Shekem (obodo mgbaba), na Gaza, 68na Jokmeam, na Bet-Horon, 69na Aijalon, na, Gat Rimọn, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ gbara ya gburugburu.
70Site nʼọkara ebo Manase, ndị Izrel nyere ndị ikwu Kohat fọdụrụ obodo ndị a: Anea na Bileam, tinyere ala ebe ịta nri anụ ụlọ ha.
Copyright information for IboBIU