2 Samuel 17:27-29

27Mgbe Devid bịarutere Mahanaim, Shobi nwa Nahash onye obodo Raba nke dị nʼala ndị Amọn, na Makia
Makia bụ nwoke ahụ nabatara Mefiboshet nʼụlọ ya. 2Sa 9:4
nwa Amiel onye si Lo Deba, na Bazilai, onye Gilead si Rogelim
28wetara ute e ji edina ala, na ite isi nri, na efere e ji eri nri bụ ọrụ onye ọkpụ ite. Tinyere ọka wiiti na ọka balị, ụtụ ọka na ọka a ṅara nʼọkụ, akịdị na lentil. 29O wetakwara mmanụ aṅụ, na bọta, atụrụ na chiizi nke sitere na mmiri ara ehi nye Devid na ndị so ya ka ha rie. Nʼihi na ha sịrị, “Ike agwụla ndị mmadụ, agụụ na-agụ ha, akpịrị na-akpọkwa ha nkụ, nʼime ọzara.”

Copyright information for IboBIU