Exodus 37:25-28

Ebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ

25Ha ji osisi akashia wuo ebe ịchụ aja a na-anọ esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Akụkụ anọ ya ha nʼotu. Ogologo ya na obosara ya bụ iri sentimita anọ na ise. Ịdị elu ya bụ iri sentimita itoolu. Mpi ya niile si na ya pụta. 26Ha ji ọlaedo a nụchara anụcha machie elu ya; akụkụ ya niile nakwa mpi ya niile. Ha jikwa ọlaedo kpụlite ọnụ ọnụ ya gburugburu. 27Ha kpụnyere mgbaaka ọlaedo abụọ nʼokpuru ihe ahụ akpụlitere akpụlite, abụọ na ncherita ihu akụkụ ọ bụla, ebe a ga na-ejide mkpara e ji ebu ya. 28Ha ji osisi akashia mee mkpara ndị ahụ. Jirikwa ọlaedo machie ha.

Copyright information for IboBIU