Joshua 15:1-6

Oke ndị Juda

1Ala ndị a ka e nyere ndị Juda dịka ikwu dị nʼebo ahụ si dị. Ikwu ọbụla ketara ala nke ha site nʼife nza. Ala Juda gbatịrị nnọọ ruo nʼoke ala Edọm, gbatịakwa ruo nʼọzara Zin, kwụsị nʼọnụ ọnụ ndịda ọzara a.

2Nʼakụkụ ndịda, oke ala ha malitere nʼọnụ ọnụ ndịda osimiri Nnu.
Maọbụ, Osimiri Nwụrụ anwụ.
3Site nʼebe akụkụ ndịda nrigo Akrabim, gafee ruo nʼọzara Zin, ma rigoo nʼakụkụ nke ndịda Kadesh Banea, gafee Hezrọn rigoruo na Aada, gba gburugburu gaa Kaka; 4site nʼebe ahụ ruo Azmọn, pụọ gbasoro iyi dị nʼoke ala ndị Ijipt gagide ruo nʼosimiri Mediterenịa. Nke a bụ oke ala nʼebe ndịda.
5Oke ala ha nʼọwụwa anyanwụ bụ oke osimiri Nnu, ruo nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan.
Oke ala ha nʼakụkụ ugwu bidoro nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan,
6gbatịrị ruo Bet-Hogla, ma ruo nʼugwu Bet-Araba,
Maọbụ, Osimiri Mediterenịa Ọnụ 34:14
rukwaa na nkume Bohan, nwa Ruben.
Copyright information for IboBIU