Judges 11:4-33

4O ruo mgbe ọtụtụ oge gasịrị, ndị Amọn busoro ụmụ Izrel agha. 5Ndị okenye Gilead jere ịkpọpụta Jefta site nʼala Tob. 6Ha sịrị ya, “Bịa buru onyeisi agha anyị ka anyị nwee ike ibuso ndị Amọn agha.”

7Jefta sịrị ha, “Unu akpọghị m asị, a ma chụpụkwa m site nʼụlọ nna m? Gịnị mere unu ji na-achọ m ugbu a unu nọ nʼoke nsogbu?”

8Ndị okenye Gilead sịrị ya, “na-agbanyeghị nke a, anyị abịaghachikwutela gị ugbu a, bịa ka anyị na gị lụso ndị Amọn agha. Ị ga-abụkwa onyeisi anyị niile bi na Gilead.”

9Jefta zara, “A sịkwarị na m esoro unu gaa lụso ndị Amọn agha, ọ bụrụ na Onyenwe anyị enyefee ha nʼaka m, m ga-abụ onyeisi unu nʼezie?”

10Ndị okenye Gilead zara, “Onyenwe anyị bụ onye akaebe, na anyị aghaghị ime dịka i kwuru.” 11Ya mere, Jefta sooro ndị okenye Gilead, ha mekwara ya onyeisi ha na ọchịagha ha. O kwughachikwara okwu ya niile nʼihu Onyenwe anyị nʼobodo Mizpa.

12Mgbe ahụ, Jefta zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru eze ndị Amọn jụọ ya ajụjụ sị, “Gịnị bụ ihe i nwere megide anyị i ji ebuso ala anyị agha?”

13Eze ndị Amọn zaghachiri ndị ozi Jefta, “Mgbe ụmụ Izrel si nʼala Ijipt pụta, ha ji aka ike napụ anyị ala anyị, site nʼosimiri Anọn ruo na Jabọk, rukwaa nʼosimiri Jọdan. Ugbu a nyeghachinụ anyị ala ahụ niile nʼudo.”

14Jefta zighachiri ndị ozi ka ha jekwuru eze ndị Amọn, 15na-asị,

“Ihe ndị a ka Jefta sịrị: Izrel esiteghị nʼaka ike napụ Moab maọbụ Amọn ala ha.
16Kama, mgbe ha si Ijipt rigopụta, Izrel sitere nʼọzara bịaruo Osimiri Uhie, sikwa nʼebe ahụ ruo Kadesh. 17Mgbe ahụ, Izrel zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru eze Edọm sị ya, ‘Kwere ka anyị si nʼala gị gafere,’ ma eze Edọm jụrụ ajụ. Ha zipụkwara ozi nye eze Moab, ma o kwenyeghị. Nʼihi ya, Izrel nọgidere na Kadesh.

18“Ọzọ, ha sitere nʼọzara gaa gburugburu Edọm na Moab, site nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ala Moab, maa ụlọ ikwu ha nʼofe Anọn. Ha abaghị nʼoke ala Moab, nʼihi na Anọn bụ oke ala ya.

19“Mgbe ahụ, ụmụ Izrel zigara ndị ozi ka ha jekwuru Saịhọn eze ndị Amọrait, onye bi na Heshbọn, sị ya, ‘Biko, ka anyị site nʼala gị gafee ruo nʼala nke anyị.’ 20Ma eze Saịhọn atụkwasịghị Izrel obi isite nʼoke ala ya gabiga. Nʼihi nke a, ọ chịkọtara usuu ndị agha ya, ma ụlọ ikwu na Jahaz, buso ụmụ Izrel agha.

21“Mgbe ahụ, Onyenwe anyị, Chineke Izrel nyere Saịhọn na ndị agha ya niile nʼaka Izrel. Ha merikwara ha. Izrel nwetara ala niile nke ndị Amọrait, bụ ndị bi nʼala ahụ. 22Ha nwetara ala niile ahụ, site nʼAnọn ruo Jabọk, sitekwa nʼọzara ruo Jọdan.

23“Ma ugbu a, Onyenwe anyị, Chineke Izrel achụpụla ndị Amọrait nʼihu ndị ya bụ Izrel. Olee ikike i nwere iwere ala ahụ? 24Ọ bụghị ihe chi gị, Kemosh, nyere gị ka i ga-enweta? Otu aka ahụ kwa, ihe ọbụla Onyenwe anyị Chineke anyị nyere anyị ka anyị ga-enweta. 25Ị dị mma karịa Balak nwa Zipoa, eze Moab? O nwere mgbe ọ chọrọ Izrel okwu, maọbụ lụso ha agha? 26Ọ bụ narị afọ atọ kemgbe ụmụ Izrel malitere ibi na Heshbọn na Aroea, na nʼime obodo ndị ọzọ gbara ha gburugburu ruo nʼiyi Anọn. Ọ bụkwa gịnị mere na ịnapụtaghị ala ndị a nʼoge ndị ahụ? 27Emegideghị m gị, kama ọ bụ gị na-emejọ m, site nʼibuso m agha. Ka Onyenwe anyị, onye na-ekpe ikpe ziri ezi kpebie ikpe a taa nʼetiti ndị Izrel na ndị Amọn.”

28Ma eze Amọn egeghị ntị nʼozi Jefta ziri ka e zie ya.

29Nʼoge ahụ, mmụọ Onyenwe anyị dakwasịrị Jefta. Site nʼike mmụọ ahụ, o duuru ndị agha Izrel gafee obodo Gilead na Manase, gafeekwa Mizpa, nke dị nʼime Gilead, gaa lụso ndị Amọn agha. 30Jefta kwere Onyenwe anyị nkwa sị ya, “Ọ bụrụ na ị ga-enyefe ndị Amọn nʼaka m, 31ihe ọbụla sitere nʼọnụ ụzọ ụlọ m pụta izute m mgbe m lọghachiri nʼọnọdụ mmeri megide ndị Amọn, ga-abụ nke Onyenwe anyị. Aga m eji ya chụọ aja nsure ọkụ.”

32Jefta duuru ndị agha ya gaa ibuso Amọn agha. Onyenwe anyị nyekwara ya mmeri dị ukwuu. 33O bibiri iri obodo abụọ site nʼAroea ruo nso nso Minit, ruokwa Ebel-Keramim. Otu a ka Izrel si merie ndị Amọn.

Copyright information for IboBIU